Ecclesiastes 4

Mmegbu, ndọgbu nʼọrụ, na enweghị enyi

1Ọzọ, ahụrụ m mmegbu na obi ilu niile dị nʼokpuru anyanwụ,

anya mmiri akwa ndị a na-emegbu emegbu,
ma ọ dịkwaghị ndị nkasiobi ha nwere,
ma ike dị nʼaka ndị mmegbu a,
ma ha enwekwaghị ndị nkasiobi.
2Nʼihi ya, ekwuru m, na ndị nwụrụ anwụ,
bụ ndị nwụrụ anwụ mgbe gara aga,
ka ndị dị ndụ mma,
bụ ndị nke dị ndụ ruo ugbu a.
3Ma ọ dị mma karịa ha abụọ
bụ onye ahụ a na-amụbeghị,
onye na-ahụbeghị ihe ọjọọ
nke dị nʼokpuru anyanwụ.
4Achọpụtakwara m na ihe mere ndị mmadụ ji na-adọgbu onwe ha nʼọrụ bụ nʼihi anya ụfụ ha nwere nʼebe ihe ndị agbataobi ha dị. Nke a bụ ihe efu, ịchụso ifufe.

5Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata,
na-eri anụ ahụ onwe ya. a
6Ọ ka mma inwe ihe ntakịrị na obi udo,
karịa mmadụ inweju akụ site nʼịdọgbu onwe ya nʼọrụ,
nke bụ naanị ịchụso ifufe.
7Ọ dịkwa ihe ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ bụ naanị ihe efu.

8Ọ dị otu nwoke nke naanị ya nọ,
o nweghị nwa, o nwekwaghị ụmụnne.
Mgbe niile, ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ,
ma nke a emeghị ka afọ ju ya nʼakụnụba o nwere.
Ọ jụrụ sị, “Ọ bụ nʼihi onye ka m ji adọgbu onwe m nʼọrụ,”
“nʼihi gịnị ka m ji anapụ onwe m ihe obi aṅụrị?”
Ihe nke a enweghị isi,
ihe efu na-eweta obi mgbawa ka ha bụ.

9Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye,
nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe:
10Otu onye nʼime ha daa,
onye nke ọzọ ga-apalite ya.
Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye,
onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu.
11Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ,
ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ?
12Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo,
ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha.
Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.

Ọganihu enweghị isi

13Ọ ka mma ịbụ nwantakịrị na onye ogbenye nwere nghọta karịa ịbụ agadi bụ eze ndị nzuzu, onye na-adịghị aṅa ntị na ndụmọdụ ọbụla. 14Nwata dị otu a, ma eleghị anya, ọ ga-esi nʼụlọ mkpọrọ pụta bụrụ eze, ma ọ bụkwanụ na a mụrụ ya ogbenye nʼalaeze ahụ. 15Ahụrụ m na mmadụ niile ndị bi nʼokpuru anyanwụ na-eso nwantakịrị ahụ onye nọchiri anya eze. 16A pụghị ịgụta ndị dịnyere ya, ma ndị ga-esota nʼazụ agaghị enwe ọṅụ nʼebe onye nọchiri eze ahụ nọ. Ọzọkwa, nke a bụ ihe efu, naanị ịchụso ifufe.

Copyright information for IboBIU